Psalms 18

Abụ ọma Devid. Abụ Devid ohu Onyenwe anyị. Ọ bụụrụ Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. Ọ sịrị:

Abụ mmeri

1O Onyenwe anyị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m.

2 Onyenwe anyị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.
Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya.
Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya.

3Akpọkuru m Onyenwe anyị, onye e kwesiri inye otuto,
ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m.
4Ụdọ niile nke ọnwụ kere m agbụ;
ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.
5Ụdọ nke ili kere m gburugburu,
ọnya nke ọnwụ guzogidere m.

6Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị;
etiri m mkpu akwa, kpọkuo Chineke m ka o nyere m aka;
akwa m rutekwara ya ntị,
o sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m.
7Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji,
ntọala niile nke ugwu niile makwara jijiji,
ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya.
8Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta,
ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta;
icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta.
9O kewara mbara eluigwe, rịdata;
oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya.
10Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim
Cherubim bụ mmụọ ndị ahụ dị ike na ndị jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ. Ọrụ ha bụ ibu ocheeze Ebube ahụ. Izk 1:26
felie elu,
o feliri elu nʼelu nku nke ifufe.
11O mere ọchịchịrị ebe nzuzo ya, ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,
bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe.
12Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, igwe ojii
ji mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe gabiga.
13 Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ;
olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda.
14Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa,
o jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha.
15E kpughere ala ala nke oke osimiri,
gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ,
site nʼịba mba gị, O Onyenwe anyị,
na nkuume si gị nʼimi pụta.

16O sitere nʼelu setịpụ aka ya,
jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile.
17Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike,
bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m.
18Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m,
ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere.
19Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara,
ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ.

20 Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị;
ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.
21Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị,
ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ.
22Iwu ya niile dị nʼihu m,
esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m.
23Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya,
edebekwara m onwe m pụọ na mmehie.
24 Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị,
dịka ịdị ọcha nke aka m abụọ si dị nʼanya ya.

25Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi,
nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke.
26Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,
ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ.
27Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,
ma ị na-eme ka ndị nwere anya mpako dị ala.
28Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, na-eme ka oriọna m na-enwu,
Chineke m na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.
29Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ,
sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.

30Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke,
okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha;
ọ bụ ọta
Ya bụ, ebe nchebe
nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.
31Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị?
Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị?
32Ọ bụ Chineke na-enye m ike,
na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.
33Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele;
Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu.
34Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha,
ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz.
35Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m,
aka nri gị na-akwagidekwa m,
inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.
36Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ,
ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ.

37Achụrụ m ndị iro m ọsọ, jidekwa ha;
alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi.
38Etidara m ha nʼala ebe ha enwekwaghị ike ibilite.
Ha dara nʼokpuru ụkwụ m.
39Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha,
i wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m.
40I mere ka ndị iro m tụgharịa gbapụ ọsọ.
Ebibikwara m ndị kpọrọ m asị.
41Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha.
Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha.
42Egwepịara m ha nke ọma dịka ntụ nke ikuku na-ebufu;
a zọtọrọ m ha dịka apịtị nke okporoụzọ.
43Ị napụtala m site nʼaka ndị na-alụso m ọgụ
ị meela m onyeisi nke ọtụtụ mba;
ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi.
44Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu,
ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m.
45Obi na-ada ha mba;
ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta.

46 Onyenwe anyị na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m!
Mbuli elu dịrị Chineke, Onye nzọpụta m.
47Ọ bụ Chineke ahụ onye na-abọrọ m ọbọ,
onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m,
48onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m.
I mere ka m dị elu karịa ndị iro,
napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike.
49Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche,
aga m abụku aha gị abụ otuto.

50Ọ na-enye eze ya mmeri dị ukwuu;
Ọ na-egosikwa onye ya onye e tere mmanụ ịhụnanya na-adịghị ada ada,
nye Devid na ndị agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
Copyright information for IboBIU